5 Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi abua, n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, ala nsọ ka ọ bu.
6 Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.
7 Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;
8 M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.
9 Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.
10 Ub͕u a kwa, bia, M'gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n'Ijipt puta.
11 Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m'bu, na m'gējekuru Fero, na m'gēme kwa ka umu Israel si n'Ijipt puta?