26 Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu.
27 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, n'elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya.
28 O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo.
29 O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.