17 Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu.
18 Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu.
19 Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha.
20 Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla.
21 Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.
22 Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu.
23 Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.