22 M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa.
23 M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi.
24 Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu.
25 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka.
26 Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume?
27 Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n'ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me.
28 Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.