28 Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.
29 Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n'ebe i nọ pua, m'gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n'ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà.
30 Moses we si n'ebe Fero nọ pua, we riọ Jehova.
31 Jehova we me dika okwu Moses si di; O we wezuga odudu n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ; ọ dighi otù fọduru.