36 ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.
37 Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?
38 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà?
39 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi?
40 Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.
41 Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:
42 n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem: