36 Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere.
37 O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n'obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.
38 Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche.
39 O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.
40 O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour?
41 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.
42 O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ.