14 i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
15 Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu.
16 Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu:
17 nwoke ọ bula dika onyinye aka-ya si di, dika ngọzi Jehova, bú Chineke-gi, si di, nke O nyeworo gi.
18 I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.
19 Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.
20 Ezi omume, ezi omume ka i gāb͕aso, ka i we di ndu, we nweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.