11 dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
12 Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.
13 Ndi Israel nile gānu kwa, tu kwa egwu, we ghara ime nganga ọzọ.
14 Mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, i we nweta ya, biri nime ya, si, M'gēdo eze ka ọ buru ezem, dika mba nile si eme ndi dim buruburu;
15 i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n'etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi.
16 Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.
17 Ọ gaghi-eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya we ghara iwezuga onwe-ya: ọ gaghi-eme kwa ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke-uku.