9 Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n'etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.
10 Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n'aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n'agha n'agha,
11 i we hu nwayi nke mara nma n'aru n'usu ndi adọtara n'agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye;
12 i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya,
13 yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye.
14 O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n'ego ma-ọli, emela ya dika orù, n'ihi na i wedawo ya n'ala.
15 Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;