23 Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.
24 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.
25 Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe:
26 emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.
27 Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.
28 Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì.
29 Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.