1 O we kpọ òkù na ntim abua n'oké olu, si, Bianu nso, unu ndi-nlekọta nke obodo, onye ọ bula ya jide kwa ihe o ji bibi madu n'aka-ya.
2 Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla.
3 Ma ebube nke Chineke nke Israel siri n'elu cherub ahu nke ọ di n'elu ya rigorue nbata-uzọ nke ulo ahu: O we kpọ nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink nke ode-akwukwọ n'úkwù-ya, òkù.
4 Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.
5 Ma ndikom isi ahu ka Ọ siri na ntim abua, Sonu ya gabiga n'obodo a, tib͕u kwa: anya-unu emela ebere, unu enwe-kwa-la ọmiko:
6 b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.
7 O we si ha, Meruanu ulo a, me ka ndi eb͕uru eb͕u ju ogige-ya nile: puanu. Ha we pua, tib͕ue n'obodo.