37 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n'ile anya;
38 onye-nchu-àjà gēsi kwa n'ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa:
39 onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo;
40 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú:
41 ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú:
42 ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.
43 Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;