17 Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.
18 Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi.
19 Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.
20 Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n'arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi:
21 M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.
22 Unu gāgha kwa nkpuru n'arọ nke-asatọ, rie ufọdu nime ihe-ọmume ahu, bú ihe ochie; rue arọ nke-iteghete, rue mb͕e ihe-ọmume-ya gābata, unu gēri ihe ochie.
23 Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n'ihi na Mu nwe ala ahu: n'ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n'alam.