27 Ma ọ buru na ọ di n'etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di.
28 Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova.
29 Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n'etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua.
30 Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova.
31 Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n'uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya.
32 Otù uzọ kwa n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n'okpuru nkpa-n'aka, otù uzọ n'uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova.
33 Ọ gaghi-etucha n'etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya.