32 Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu.
33 Onye ahu n'etiti umu-ndikom Eron nke nēweta nso ọbara nke àjà-udo nile, na abuba-ha, ya gēnwe utaku-ukwu aka-nri ahu ka ọ buru òkè-ya.
34 N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel.
35 Nka bu òkè otite-manu Eron, na òkè otite-manu umu-ya ndikom, sitere n'àjà-ọku nke Jehova, n'ubọchi O mere ka ha biarue nso iburu Jehova ndi-nchu-àjà;
36 bú nke Jehova nyere iwu ka enye ha site n'aka umu Israel, n'ubọchi O tere ha manu. Ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.
37 Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo;