8 Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya.
9 Ọzọ, onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke anēsi n'ite-ọku, na ihe ọ bula anēme n'ihe ighe ihe, na n'ite isi ihe, onye-nchu-àjà nke nēweta ya nso, ya onwe-ya gēnwe ya.
10 Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.
11 Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.
12 Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.
13 N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.
14 O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya.