11 Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
12 Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
13 Àjà-nsure-ọku ka ha me-kwa-ra ka o rue ya aka, n'ọbubọ, na isi-ya; ọ we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.
14 Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà.
15 Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.
16 Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di.
17 Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.