17 M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.
18 Gi si kwa ndi Israel, Do onwe-unu nsọ bayere echi, unu gēri kwa anu: n'ihi na unu akwawo ákwá na nti Jehova, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? n'ihi na ọ diri ayi nma n'Ijipt: Jehova gēnye kwa unu anu, unu gēri kwa.
19 Ọ bughi otù ubọchi ka unu gēri anu, ọ bughi ubọchi abua, ọ bughi ubọchi ise, ọ bughi ubọchi iri, ọ bughi orú ubọchi;
20 rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta?
21 Moses we si, Orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise ndi ji ukwu eje ka ndi ahu di, bú ndi mu onwem nọ n'etiti ha: ma Gi onwe-gi asiwo, Anu ka M'gēnye ha, ka ha we rie otù ọnwa zuru ezù.
22 Ọ̀ bu ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi ka agēb͕uru ha, ka o we zue ha? ọ̀ bu azù nile nke oké osimiri ka agāchikọtara ha, ka o we zue ha?
23 Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.