9 Iwe Jehova we di ọku megide ha; Ọ we la.
10 Igwe-oji ahu we si n'elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta.
11 Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya.
12 Biko, ka ọ ghara idi ka onye nwuru anwu, nke nkera anu-aru-ya richapuworo mb͕e o si n'àkpà-nwa nne-ya puta.
13 Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko.
14 Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n'iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel.
15 Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel.