14 Nke diri ebo Naftali bu Nahbi nwa Vọfsi.
15 Nke diri ebo Gad bu Geuel nwa Maki.
16 Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua.
17 Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu:
18 we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu;
19 na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike;
20 na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine.