16 Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem:
17 n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka.
18 Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku.
19 Ma ub͕u a, biko, nọdunu n'ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m'we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ.
20 Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.
21 Belam we bilie n'ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je.
22 Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.