22 Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.
23 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ.
24 Mọ-ozi nke Jehova we guzo n'uzọ di warara n'etiti ubi-vine, ogige di n'otú akuku, ogige di kwa n'akuku nke-ọzọ.
25 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, ọ we nuba onwe-ya na mb͕idi, nuba kwa ukwu Belam na mb͕idi ahu: o we tie ya ihe ọzọ.
26 Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n'ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.
27 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, o we makpuru n'okpuru Belam: iwe Belam we di ọku, o were nkpa-n'aka-ya tie nne-inyinya-ibu ahu.
28 Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m'meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia?