14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
15 Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
16 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu,Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie,We mapue akuku nile nke Moab,Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,
18 Edom gābu kwa ihe-nnweta,Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.
19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.
20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.