17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie,We mapue akuku nile nke Moab,Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,
18 Edom gābu kwa ihe-nnweta,Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.
19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.
20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.
21 Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.
22 Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.
23 Ọ we tua ilu-ya, si,Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?