59 Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.
60 Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama.
61 Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ.
62 Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel.
63 Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.
64 Ma n'etiti ndia ọ dighi nwoke ọ bula di sitere na ndi Moses na Eron, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ọzara Sainai.
65 N'ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n'ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.