3 Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.
4 Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n'azu-ya buruburu.
5 Unu gātu kwa n'azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n'etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha.
6 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha.
7 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha.
8 Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile.
9 Jehova we gwa Moses okwu, si,