16 Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya.
17 Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha.
18 N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū.
19 Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije.
20 Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije.
21 Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n'anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n'ututu, ha we bulie ije: ma n'ehihie ma n'abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije.
22 Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije.