20 ọ we bata n'etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n'abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n'abali ahu nile.
21 Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.
22 Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha.
23 Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n'etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya.
24 O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.
25 O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.
26 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha.