9 O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.
10 Ndi Israel nile we hu ogidi igwe-oji ka o nēguzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū ahu: ndi ahu nile we bilie, kpọ isi ala, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya.
11 Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.
12 Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.
13 Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.
14 Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.
15 Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n'ebe a rigo.