17 na ákwà-ngechi nile nke ogige, na ide-ya nile, na ukwu-ha, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu:
18 na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu; na ǹtú nile nke ogige, na udọ̀ nile ha;
19 na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-àjà, nwere, na uwe umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.
20 Nzukọ nile nke umu Israel we si n'iru Moses pua.
21 Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu.
22 Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n'olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova.
23 Onye ọ bula nke achọtara n'aka-ya ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu, na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, chitara ha.