24 ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.
25 Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.
26 Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu:
27 unu we tamu ntamu n'ulo-ikwū-unu, si, N'asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n'ala Ijipt puta, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi.
28 Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.
29 M'we si unu, Unu amala jijiji, unu atu-kwa-la egwu ha.
30 Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n'iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n'Ijipt n'anya-unu;