24 Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.
25 Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu.
26 Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya.
27 Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
28 Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha.
29 N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
30 Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù nke ọrurú-ya.