Levitikọs 16:13-19 IGBOB

13 ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n'elu ọku n'iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu:

14 ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n'iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n'Iru-anyanwu; ọ bu kwa n'iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa.

15 Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:

16 ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha.

17 Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.

18 Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.

19 Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel.