15 Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n'ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi:
16 rue echi nke ubọchi-izu-ike nke-asa ka unu gāgu ọgu ubọchi abua na iri, unu gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu.
17 Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu.
18 Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.
19 Unu gēme kwa otù nkpi ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa umu-ebulu abua nke b͕ara otù arọ ka ha buru ihe àjà nke àjà-udo.
20 Onye-nchu-àjà gēfé kwa ha tiyere achicha nke nkpuru mbu ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova tiyere umu-aturu abua ahu: nsọ ka ha gādiri Jehova n'ebe onye-nchu-àjà nọ.
21 Unu gākpọsa kwa òkù n'otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile.