10 Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.
11 Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.
12 Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.
13 N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.
14 O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya.
15 Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.
16 Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya: