12 Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?
13 Òle ebe m'gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n'ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie.
14 Apughm, nání mu onwem, ikuru ndi nka nile, n'ihi na ọ karirim arọ́.
15 Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.
16 Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.
17 M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.
18 Gi si kwa ndi Israel, Do onwe-unu nsọ bayere echi, unu gēri kwa anu: n'ihi na unu akwawo ákwá na nti Jehova, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? n'ihi na ọ diri ayi nma n'Ijipt: Jehova gēnye kwa unu anu, unu gēri kwa.