10 Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.
11 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?
12 M'gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M'gānapu kwa ha ihe ha nwere, M'gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha.
13 Moses we si Jehova, Ndi Ijipt gānu kwa ya; n'ihi na I were ike-Gi me ka ndi nka si n'etiti ha rigoputa;
14 ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali.
15 Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si,
16 N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara.