3 Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
4 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
5 Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!
6 Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,Dika osisi cedar n'akuku miri.
7 Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa,Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri,Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,Agēbuli kwa ala-eze-ya.
8 Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere:O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.
9 Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.