17 Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa,
18 na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n'etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma.
19 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ.
20 Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe.
21 Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.
22 Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa.
23 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise.