Jenesis 41 IGBOB

1 O rue, n'ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n'akuku osimiri Nail.

2 Ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n'anu-aru-ha; ha we nāta nri n'etiti ubi.

3 Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n'osimiri Nail rigoputa n'azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n'anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n'usọ osimiri Nail.

4 Ehi ahu ndi jọrọ njọ ile anya, ndi takwara aru n'anu-aru-ha, we rie ehi asa ahu mara nma ile anya ma kwa abuba. Fero we teta.

5 O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma.

6 Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.

7 Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.

8 O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.

9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta:

10 Fero were iwe n'aru ndi-orù-ya, tinye m n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite:

11 ayi we rọ nrọ n'otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ.

12 Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.

13 O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m'lata n'ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu.

14 Fero we ziga kpọ Josef, ha we me ka o si n'olùlù ahu b͕aputa: ọ kọpu isi-ya, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya nile, bakute Fero.

15 Fero we si Josef, Nrọ ka m'rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya.

16 Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero.

17 Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m'nēguzo n'usọ osimiri Nail:

18 ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara abuba n'anu-aru-ha, ma kwa nma n'aru; ha we ta nri n'etiti ubi:

19 ma, le, ehi asa ọzọ nārigoputa n'azu ha, ha adighi nma, jọ njọ n'aru nke-uku, ta kwa aru n'anu-aru-ha, ahughm otú ndi ahu n'ijọ-njọ n'ala Ijipt nile:

20 ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba:

21 ma mb͕e ha basiri n'afọ-ha, amaghi na ha barari n'afọ-ha; ma ha jọrọ njọ ile anya, dika na nmalite. M'we teta.

22 M'we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma:

23 ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu:

24 oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya.

25 Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.

26 Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu.

27 Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu.

28 Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya.

29 Le, arọ asa nābia nke aganēriju afọ nke-uku n'ala Ijipt nile:

30 arọ asa nke oké unwu gēbili kwa ma ndia gasia; agēchezọ kwa iriju-afọ nile n'ala Ijipt; oké unwu ahu gēb͕upia ala ahu;

31 agaghi-ama iriju-afọ ahu n'ala nka n'ihi oké unwu ahu nke nēso ya; n'ihi na arọ́ ka ọ gādi nke-uku.

32 Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya.

33 Ma ub͕u a, ka Fero leputa nwoke nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, ka o do kwa ya onye-isi ala Ijipt nile.

34 Ka Fero me nka, me kwa ka ndi-nlekọta ala nka, ka ọ were kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ala Ijipt n'arọ asa ahu anēriju afọ.

35 Ka ha chikọta kwa ihe-oriri nile nke ezi arọ ndia nke nābia, ka ha kwakọba kwa ọka n'okpuru aka Fero ibu ihe-oriri n'obodo Ijipt nile, ka ha debe kwa ya.

36 Ihe-oriri ahu gābu ihe agēdebere ala nka rue arọ asa nke oké unwu ahu nke gādi n'ala Ijipt; ka ewe ghara ibipu ala nka n'oké unwu ahu.

37 Ihe ahu di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya nile.

38 Fero we si ndi-orù-ya, Àyi gāchọta madu dika onye a, bú nwoke nke mọ Chineke di nime ya?

39 Fero we si Josef, Ebe Chineke meworo gi ka i mara ihe a nile, ọ dighi onye nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, dika gi:

40 gi onwe-gi gābu onye-isi ulom, ọ bu kwa n'okwu ọnu-gi ka ndim nile gēdo onwe-ha n'usoro: nání n'oche-eze ka m'gādi uku kari gi,

41 Fero we si Josef, Le, edowom i onye-isi ala Ijipt nile.

42 Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya,

43 me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile.

44 Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n'ala Ijipt nile.

45 Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt.

46 Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile.

47 N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne.

48 O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya.

49 Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta.

50 Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.

51 Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam.

52 Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.

53 Arọ asa ahu nke nriju-afọ, nke di n'ala Ijipt, we gwu.

54 Arọ asa ahu nke oké unwu we malite ibia, dika Josef siri; oké unwu we di n'ala nile; ma nri di n'ala Ijipt nile.

55 Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya.

56 Oké unwu ahu we dikwasi n'elu uwa nile: Josef we meghe ebe nile nke ọka di nime ha, ọ we re ọka nye ndi Ijipt; oké unwu ahu we sie ike n'ala Ijipt.

57 Ma uwa nile biaruru Ijipt, biakute Josef, izuru ọka; n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'uwa nile.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50