Jenesis 18 IGBOB

1 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;

2 o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,

3 si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga:

4 biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a:

5 ka m'weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n'obi-unu; emesia gabi-ganu: n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru.

6 Abraham we me ngwa ba n'ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha.

7 Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya.

8 O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie.

9 Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n'ulo-ikwū.

10 Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n'arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n'azu ya.

11 Ma Abraham na Sera ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ha nāgwu; ọ ghawori idiri Sera dika ọ nādiri ndinyom.

12 Sera we chì ọchì nime onwe-ya, si, M'gēnwe ihe-utọ mb͕e m'kasiri nká, onye-nwem bu kwa agadi?

13 Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m'gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi?

14 Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.

15 Sera we gọ, si, Achighm ọchì; n'ihi na ọ nātu egwù. Ọ si, É-è; kama i chiri ọchì.

16 Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.

17 Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;

18 ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya?

19 N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.

20 Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie;

21 ka M'rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M'mara.

22 Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.

23 Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu?

24 Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?

25 Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n'ikpe?

26 Jehova we si, Ọ buru na achọtam nime Sọdọm ọgu ndi ezi omume abua na iri n'etiti obodo ahu, M'gāb͕aghara ebe ahu nile n'ihi ha.

27 Abraham we za, si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu, mu onwem, nke bu ájá na ntu:

28 eleghi anya madu ise agaghi-adi n'ọgu ndi ezi omume abua na iri ahu: Ì gēbibi obodo ahu nile n'ihi madu ise ahu nādighi ya? Ọ si, M'gaghi-ebibi ya, ma M'chọta n'ebe ahu ọgu abua na ise.

29 Ọ gwa kwa Ya okwu ọzọ, si, Eleghi anya agāchọta n'ebe ahu ọgu abua. Ọ si, M'gaghi-eme ya n'ihi ọgu abua ahu.

30 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú na iri. Ọ si, M'gaghi-eme ya, ma M'chọta n'ebe ahu orú na iri.

31 Ọ si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi orú ahu.

32 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu nání otù ub͕ò a: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu iri. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi iri ahu.

33 Jehova we la, mb͕e Ọ gwabisiri Abraham okwu: Abraham we lata n'ọnọdu-ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50