Jenesis 13 IGBOB

1 Abram we si n'Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile ọ nwere, na Lot tiyere ya, rue Negeb.

2 Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo.

3 O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai;

4 rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n'ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu.

5 Ọzọ kwa, Lot, onye ya na Abram nāyikọ je, ọ nwere igwè ewu na aturu, na igwè ehi, na ọtutu ulo-ikwū.

6 Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n'otù: n'ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n'otù.

7 Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu.

8 Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu.

9 Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe.

10 Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.

11 Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya.

12 Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.

13 Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.

14 Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu:

15 n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.

16 M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.

17 Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya.

18 Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50