Jenesis 26 IGBOB

1 Oké unwu we di n'ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n'ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera.

2 Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n'Ijipt; biri n'ala ahu nke M'gāsi gi biri:

3 nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;

4 M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;

5 n'ihi na Abraham gere nti n'olum, we debe ihe-ndebem, ihe nile M'nyere n'iwu, ukpurum nile, na iwum nile.

6 Aisak we biri na Gera:

7 ndikom ebe ahu we jua ya ajuju bayere nwunye-ya; ọ si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: n'ihi na ọ turu egwu isi, Ọ bu nwunyem; ka ndikom ebe a we ghara ib͕um n'ihi Rebeka, ka o kwuru: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

8 O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n'ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú.

9 Abimelek we kpọ Aisak, si, Le, nwunye-gi ka ọ bu n'ezie: ì si kwa aṅa si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? Aisak we si ya, N'ihi na asirim, Ka m'ghara inwu anwu n'ihi ya.

10 Abimelek we si, Gini bu nka i meworo ayi? ọ fọduru nwantī na otù onye nime ndi nkem gēsowori nwunye-gi dina, i gēmewo-kwa-ri ka ikpe-ọmuma biakwasi ayi.

11 Abimelek we nye ndi-ya nile iwu, si, Onye nēmetu nwoke a ma-ọbu nwunye-ya aka, aghaghi ime ka ọ nwua.

12 Aisak we gha nkpuru n'ala ahu, hu n'arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya.

13 Nwoke ahu we di uku, ọ ga n'iru, nāga n'iru n'idi uku rue mb͕e ọ di uku nke-uku:

14 ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.

15 Ma olùlù-miri nile nke ndi-orù nna-ya gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya, ndi Filistia kpochiri ha, were kwa ájá kpojue ha.

16 Abimelek we si Aisak, Si n'ebe ayi nọ la; n'ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku.

17 Aisak we si n'ebe ahu je, ma-ulo-ikwū-ya na ndagwurugwu Gera, biri n'ebe ahu.

18 Aisak we gwu kwa olùlù-miri nile ọzọ nke ha gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya; n'ihi na ndi Filistia kpuchiri ha mb͕e ọnwu Abraham gasiri: ọ kpọ ha aha di ka aha nke nna-ya kpọrọ ha-ri.

19 Ndi-orù Aisak we gwue na ndagwurugwu ahu, chọta olùlù-miri nāsuputa asuputa.

20 Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n'ihi na ha chọrọ ya okwu.

21 Ha gwue olùlù-miri ọzọ, se kwa okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Sitna.

22 O si n'ebe ahu kwapu, gwue olùlù-miri ọzọ; ma ha eseghi okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Rehobot, si, N'ihi na ub͕u a Jehova enyewo ayi ebe sara mbara, ayi gamu kwa ọmùmù n'ala nka.

23 O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba.

24 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.

25 Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri.

26 Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya.

27 Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam?

28 Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu;

29 na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.

30 Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa.

31 Ha bilie n'isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n'ebe ọ nọ la n'udo.

32 O rue n'ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri.

33 Ọ kpọ ya Shiba: n'ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta.

34 Mb͕e Isọ b͕ara ọgu arọ abua ọ luru Judit na nwunye, bú nwa-nwayi Beiri onye Het, ya na Basemat, bú nwa-nwayi Ilon onye Het:

35 ha we ghọrọ Aisak, ghọkwara Rebeka, ihe mọ-ilu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50