Jenesis 21 IGBOB

1 Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru.

2 Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya.

3 Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak.

4 Abraham we bìe nwa-ya nwoke, bú Aisak, úgwù mb͕e o ruru ubọchi asatọ, dika Jehova nyere ya iwu.

5 Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke.

6 Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem.

7 Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya.

8 Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.

9 Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.

10 Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi.

11 Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke.

12 Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.

13 Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.

14 Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.

15 Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà,

16 je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.

17 Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ.

18 Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n'aka-gi; n'ihi na mba uku ka M'gēme ya ka ọ ghọ.

19 Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.

20 Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n'ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó.

21 O biri n'ọzara Peran: nne-ya we si n'ala Ijipt lutara ya nwunye.

22 O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n'ihe nile nke gi onwe-gi nēme:

23 ma ub͕u a were Chineke ṅuaram iyi n'ebe a na i gaghi-agwa mu onwem, ma-ọbu umum, ma-ọbu umu umum, okwu-ugha: ọ bu dika ebere nke m'meworo gi si di ka i gēmerem, mekwaram ala nke i nọworo dika ọbìa nime ya.

24 Abraham we si, Mu onwem gāṅu iyi.

25 Abraham we bara Abi-melek mba n'ihi olùlù-miri nke ndi-orù Abimelek napuru ya-ri n'ike.

26 Abi-melek we si, Amaghm onye mere ihe a: ọzọ kwa, gi onwe-gi, i gosighm, ma mu onwem kwa, anughm ya, ma-ọbughi nání taa.

27 Abraham we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nye Abimelek; ha abua we b͕a ndu.

28 Abraham we debe umu-nne-aturu asa n'onwe-ha iche, bú nke ìgwè ewu na aturu.

29 Abimelek we si Abraham, Gini ka umu-nne-aturu asa ndia nke i debere n'onwe-ha iche bu?

30 Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n'akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m'gwuru olùlù-miri a.

31 N'ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n'ihi na n'ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi.

32 Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia.

33 Abraham we kua osisi tamarisk na Bia-sheba, kpọkue aha Jehova, bú Chineke Ebighi-ebi, n'ebe ahu.

34 Abraham we nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia ọtutu ubọchi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50