Jenesis 38 IGBOB

1 O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.

2 Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya.

3 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia.

4 Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.

5 Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.

6 Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.

7 Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.

8 Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.

9 Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.

10 Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.

11 Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.

12 Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu.

13 Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

14 O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye.

15 Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n'ihi na o kpuchiri iru-ya.

16 O we si n'ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n'uzọ, si, Biko, ngwa, ka m'bakuru gi: n'ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum?

17 Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n'ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya?

18 Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya.

19 Tema we bilie, la, chipu ákwà-nkpudo-ya n'aru ya, yiri uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya.

20 Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya.

21 O we jua ndikom nke ebe-ya, si, Òle ebe nwayi ahu edoro nsọ ikwa iko nọ, bú nwayi ahu nke nọduru n'Enaim n'uzọ? Ha si, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a.

22 Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a.

23 Juda we si, Ka o were ya n'onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya.

24 O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.

25 Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka.

26 Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.

27 O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya.

28 O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta.

29 O rue na, ka ọ nēseghachi aka-ya, le, nwa-nne-ya nwoke putara: nwayi ahu we si, Gini mere i ji tiwara onwe-gi ntiwa? ewe kpọ aha-ya Perez.

30 Emesia nwa-nne-ya nwoke putara, bú nke nwere ogho uhie n'aka-ya: ewe kpọ aha-ya Zera.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50