Jenesis 32 IGBOB

1 Ma Jekob jere n'uzọ-ya, ndi-mọ-ozi nke Chineke we zute ya.

2 mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim.

3 Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.

4 Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N'ulo Leban ka m'nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a:

5 enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m'we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n'iru gi.

6 Ndi-ozi ahu we laghachikute Jekob, si, Ayi biakutere nwa-nne-gi Isọ, ọzọ kwa, ọ nābia izute gi, ya na nnù ndikom.

7 Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n'-omuma-ulo-ikwū abua;

8 ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu.

9 Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma:

10 ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.

11 Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya.

12 Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di.

13 O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya;

14 ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu,

15 orú camel na iri nēnye umu ara na umu-ha, ọgu nne-ehi abua na oké-ehi iri, orú nne-inyinya-ibu na umu-inyinya-ibu iri.

16 Ọ nye ha n'aka ndi-orù-ya, n'ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n'irum, me kwa mbara n'etiti ìgwè na ìgwè.

17 Ọ we nye onye mbu iwu, si, Mb͕e Isọ, bú nwa-nnem, gēzute gi, jua gi, si, Ònye nwe gi? òle ebe i nēje kwa? ọ̀ bu kwa onye nwe ihe ndia di n'iru gi?

18 I gāsi kwa, Orù-gi Jekob nwe ha; onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu ezitere onye-nwem Isọ: ma, le, ya onwe-ya nọ kwa n'azu ayi.

19 Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya;

20 unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n'azu ayi. N'ihi na ọ siri, Ka m'were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n'irum kpuchie anya-ya, emesia m'gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma.

21 Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n'iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu.

22 Ọ we bilie n'abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob.

23 O we chiri ha, me ka ha gabiga miri-iyi ahu, me kwa ka ihe o nwere gabiga.

24 O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ.

25 Mb͕e ọ huru na ọ pughi ijide ya, o metu isi-ọsu-ya; isi-ọsu Jekob we pua n'ọnọdu-ya, mb͕e ya na ya nab͕a nb͕a.

26 Ọ si Gham ka m'la, n'ihi na chi nābọ. Ọ si, M'gaghi-agha gi ka i la, ma ọ buru na i gọzighim.

27 Ọ si ya, Gini bu aha-gi? Ọ si, Jekob.

28 Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike.

29 Jekob we jua ya, si Biko, gosim aha-gi. Ọ si N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham? Ọ gọzie ya n'ebe ahu.

30 Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.

31 Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi.

32 N'ihi nka umu Israel adighi-eri akwara nke ọkpukpu-ukwu nke di n'isi-ọsu, rue ta: n'ihi na o meturu isi-ọsu Jekob n'akwara nke ọkpukpu-ukwu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50