Jenesis 29 IGBOB

1 Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu.

2 Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu.

3 Anāchikọta kwa ìgwè aturu nile n'ebe ahu: ha akpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu ṅua, ha eweghachi nkume n'elu ọnu olùlù-miri n'ọnọdu-ya.

4 Jekob we si ha, Umu-nnem, òle ebe unu si bia? Ha si, Heran ka ayi si bia.

5 Ọ si ha, Unu mara Leban nwa Nehoa? Ha si, Ayi mara ya.

6 Ọ si ha, Ọ̀ nọ n'udo? Ha si, Ọ nọ n'udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya.

7 Ọ si, Le, ubọchi fọduru ri nne, nka abughi mb͕e anāchikọta anu-ulo: menu ka ìgwè ewu na aturu-unu ṅua miri, jenu zùa ha.

8 Ha si, Ayi apughi, rue mb͕e agāchikọta ìgwè aturu nile, ha we kpọrepu nkume n'elu ọnu olùlù miri a: ayi we me ka ìgwè ewu na aturu nua.

9 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, Rechel biara ya na ìgwè ewu na aturu nke nna-ya nwere; n'ihi na onye-ọzùzù-aturu ka ọ bu.

10 O rue, mb͕e Jekob huru Rechel, bú nwa-nwayi Leban nwa-nne-ya, na ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, na Jekob jeruru nso, kpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, ṅua.

11 Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.

12 Jekob we gosi Rechel na nwa-nne nna-ya ka ọ bu, na nwa Rebeka ka ọ bu kwa: ọ we b͕a ọsọ, gosi nna-ya.

13 O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n'ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia.

14 Leban we si ya, N'ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa.

15 Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n'ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n'efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi?

16 Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.

17 Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.

18 Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.

19 Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.

20 Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.

21 Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya.

22 Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.

23 O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya.

24 Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi.

25 O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?

26 Leban we si, Adighi-eme otú a n'ebe nke ayi, inye nke-ntà tutu enye nke-okenye.

27 Debezue abali asa nke nwayi a, ma ayi gēnye kwa gi nwayi a n'ihi òfùfè i gēfè kwa ọzọ n'akam arọ asa ọzọ.

28 Jekob we me otú a, debezu abali asa nke Lia: ọ we nye ya Rechel nwa-ya na nwunye.

29 Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.

30 Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ.

31 Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.

32 Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.

33 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N'ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m'bu, n'ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon.

34 Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.

35 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50