Jenesis 16 IGBOB

1 Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.

2 Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai.

3 Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n'ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n'ala Kenean.

4 O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n'anya-ya.

5 Serai we si Abram, Ihe-ikem di n'aru gi: mu onwem nyere nwayi nējerem ozi n'obi-gi; o we hu na ọ turu ime, ewe ledam n'anya-ya: ka Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi.

6 Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya.

7 Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.

8 Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu.

9 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n'okpuru aka-ya.

10 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di.

11 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.

12 Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n'iru umu-nne-ya nile ka o gēbi.

13 Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya?

14 N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered.

15 Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.

16 Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50