22 Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa.
23 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise.
24 Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a.
25 Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma.
26 Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.
27 Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.
28 Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.